AFRIKA NDO - Kelechi Amucha
Enyim, gaa kpatụrụm ikoro aka.
Gwaram Ohaneze na Okeọjị Afrịka adaala!
Dike abụghị n'ọnụ.
Ahụ dimkpa ahụ ogologo imi ya.
Ufu ejighị amụ nwa ụjọ.
Ọnyịrị nmegbu,
Ekweghị arịrị,
Dike ana-akpa ogwu n'anya.
Nna nwere onwe,
NELSON MANDELA
ahapụla Ụwa ọjọọ nkea.
Chukwuemeka Ojukwu na Chinua Achebe,
kulienụ n'ugwu nabata Dike asaa nke Afrịka.
Afrịka Ndo.
Enyim, gaa kpatụrụm ikoro aka.
Gwaram Ohaneze na Okeọjị Afrịka adaala!
Dike abụghị n'ọnụ.
Ahụ dimkpa ahụ ogologo imi ya.
Ufu ejighị amụ nwa ụjọ.
Ọnyịrị nmegbu,
Ekweghị arịrị,
Dike ana-akpa ogwu n'anya.
Nna nwere onwe,
NELSON MANDELA
ahapụla Ụwa ọjọọ nkea.
Chukwuemeka Ojukwu na Chinua Achebe,
kulienụ n'ugwu nabata Dike asaa nke Afrịka.
Afrịka Ndo.
No comments:
Post a Comment